Ezekiel 31:14 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ka osisi nile nke miri we ghara idi elu n'ogologo-ha, ghara kwa itiye ọnu-ọnu-ha rue etiti alaka b͕ara ọhia, ka ndi-ha ndi di ike we ghara iguzo n'idi-elu-ha, bú ndi nile nāṅu miri: n'ihi na ha nile ka ewereworo nye ọnwu, ijeru ala di n'okpuru uwa, n'etiti umu nke madu, ijekuru ndi nārida n'olùlù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ka osisi niile nke dị nʼakụkụ mmiri gharakwa eto ogologo, maọbụ ka ọnụ ọnụ ya ghakwara ịdị elu karịa alaka ndị ahụ bara ụba. Nyekwa na ọ dịkwaghị osisi ọbụla na-enwetazu mmiri nke ga-etoru osisi ndị ahụ nʼogologo. Nʼihi na edebela ha nye ọnwụ, nye ịrịdaru nʼokpuru ụwa, nʼetiti ndị mmadụ ndị na-arịda nʼolulu omimi ahụ.