Ezekiel 31:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi mb͕e ọ ridaruru n'ala-mọ emerem ka erue újú: ekpuchirim ob͕u-miri n'ihi ya, eb͕ochi-kwa-ram osimiri-ya nile, ewe b͕ochibido ọtutu miri: eme-kwa-ram ka Lebanon yiere ya uwe-nkpe, osisi nile nke ọhia tubọ-kwa-ra atubọ n'ihi ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya.