Ezekiel 31:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Emerem ka mba nile me nkpatu site n'olu nke ọdida-ya, mb͕e M'mere ka ọ ridarue ala-mọ, ya na ndi nārida n'olùlù: ewe kasie osisi nile nke Iden obi n'ala di n'okpuru uwa, bú osisi arọputara arọputa kachasi kwa nma na Lebanon, ndi nile nke nāṅu miri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma.