Ezekiel 32:24 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ebe ahu ka Ilam na ìgwè ndi-ya nile ndi nọ ílì-ya buruburu di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, ndi ridara n'ebighi-úgwù rue ala di n'okpuru uwa, bú ndi mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼebe ahụ ka Elam na usuu ndị agha ya nọ gbaa ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị e gburu egbu, ndị nwụrụ site na mma agha. Ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ arịdaruola nʼolulu ahụ dịka ndị a na-ebighị ugwu. Ha esorola ndị ahụ rịdaruru nʼala mmụọ keta oke nʼihere dịrị ha.