Ezekiel 32:25 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka ha nyeworo ya ihe-ndina n'etiti ìgwè ndi-ya nile; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na emere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, ha we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù: n'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka etiyeworo ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E meere ya ebe ndina nʼetiti ndị nwụrụ anwụ. Igwe mmadụ ya nwụrụ anwụ gbakwara ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na-emere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ, ma ha na-eburu ihere ha, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ha bụ ndị e debere nʼetiti ndị nwụrụ anwụ.