Ezekiel 32:27 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha agaghi-esoro ndi-dike dina, bú ndi dara ada site na ndi anēbighi úgwù, ndi ridaworo n'ala-mọ chiri ihe-agha-ha, ha we tọb͕ọrọ mma-agha-ha n'okpuru isi-ha, ajọ omume nile ha dikwasi n'ọkpukpu-ha; n'ihi na ujọ ndi-dike ka ha bu n'ala ndi di ndu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, e likọọla ha na ndị a na-ebighị ugwu, bụ ndị dike nʼagha, ndị nwụrụ anwụ, ndị ji ngwa agha ha gbadaa nʼime ili ha, ndị e hinyere ngwa agha ha nʼokpuru isi ha, ebe ọta ha dịkwasịrị nʼọkpụkpụ mgbe e tinyere ha nʼili. Ma nʼezie, ndị a bụ dike nʼagha mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ.