Ezekiel 32:29 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ebe ahu ka Edom na ndi-eze-ya na ndi-isi-ya nile nọ, ndi atọb͕ọworo n'idi-ike-ha n'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u: ndi ahu gēsoro ndi anēbighi úgwù, so kwa ndi nārida n'olùlù, dina.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼebe ahụ ka Edọm na ndị eze ya, na ndịisi ya niile nọ. Nʼagbanyeghị ịdị ike ha, ha na ndị e ji mma agha gbuo tọgbọrọ nʼebe ahụ. Ha na ndị a na-ebighị ugwu so dinaa, bụ ndị na-arịdaru nʼolulu.