Ezekiel 32:30 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ebe ahu ka ndi-isi Ugwu nọ, ha nile, na ndi Zaidon nile, ndi soro ndi eb͕uru eb͕u rida; n'ujọ-ha nke ha mere ka atua site n'idi-ike-ha ka ihere nēme ha; ha ewe soro ndi ejiri mma-agha b͕u dina n'ebighi-úgwù, būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ndịisi nke mba ndị ugwu, na ndị Saịdọn niile nọ nʼebe ahụ. Ụjọ niile nke ha sitere nʼisiike ha menye ndị mmadụ egbochighị ha iketa oke nʼihere nke iso ndị e gburu egbu nwụọ. Ha soro ndị eji mma agha gbuo dinaa na-ebighị ugwu, buru ihere ha, ha na-arịdaru nʼolulu.