Ezekiel 33:28 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
M'gēme kwa ka ala-unu ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, npako nke ike-ya gākwusi kwa; ugwu nile nke Israel gātọb͕ọ kwa n'efu, ghara inwe onye nāgabiga ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m eme ka ala unu ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Nganga ya, na ike ya ga-agwụsị. Obodo niile dị nʼugwu Izrel ga-aghọ ebe e tikpọrọ etikpọ, mmadụ agakwaghị esite nʼebe ahụ gafee ọzọ.