Ezekiel 33:30 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, umu ndi-gi ndi nēkwu okwu bayere gi n'akuku mb͕idi nile ha, na n'ọnu-uzọ nile nke ulo nile ha, ha agwaritawo onwe-ha okwu, onye ọ bula ọ gwa nwa-nne-ya, si, Biko, bianu, nuru ihe bu okwu a nke nēsi n'ọnu Jehova puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ndị ala gị na-ekwu banyere gị nʼakụkụ mgbidi ha na nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. Ha na-asịrịta onwe ha, ‘Bịanụ ka anyị gaa nụrụ ozi sitere nʼọnụ Onyenwe anyị.’