Ezekiel 35:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M'gēme kwa dika iwe-gi si di, na dika ekworo-gi si di nke i kwoworo site n'asì i kpọrọ ha; Mgēme kwa ka amara Mu onwem n'etiti ha, mb͕e M'gēkpe gi ikpe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi ya, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso gị mmeso dịka ịba ụba nke iwe gị na ekworo gị si dị, bụ nke i gosiri mgbe ị kpọrọ ha asị. Aga m emekwa ka ha mata onye m bụ, mgbe m kpesịrị gị ikpe.