Ezekiel 36:5 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ezie n'ọku nke ekworom ka M'kwuworo okwu megide mba nile fọduru, megide kwa Edom nile, ndi wereworo alam nye onwe-ha ibu ihe-nnweta n'ọṅù nke obi-ha nile, nime nlelì nke nkpuru-obi-ha, ka ha we chupu ya ka ọ ghọ ihe-nluta-n'agha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nke obi m ka m ji kwuo okwu megide mba ndị ọzọ, ma megidekwa Edọm, nʼihi na ọ bụ site nʼịkpọ asị nke obi ha ka ha ji mee ka ala m bụrụ ihe nnweta ha, ka ha si otu a kposaa, ma chịkọrọkwa ihe niile dị nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ala ahụ.’