Ezekiel 38:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
i gāsi kwa, M'gārigo imegide ala bu nání obodo nēnweghi mb͕idi; m'gābakwasi ndi nọ jū, ndi nọ na ntukwasi-obi, ha nile bi n'ebe nēnweghi mb͕idi, ọ dighi kwa ihe-ntuchi ma-ọbu ibo-ọnu-uzọ ha nwere:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ị ga-asị, “Aga m ebuli megide nʼala na-enweghị mgbidi, aga m awakpo ndị nọ nʼudo na-adịghị atụ anya nsogbu ọbụla, ha niile bụ ndị bi nʼebe na-enweghị mgbidi, ha enweghịkwa ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.