Ezekiel 38:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ikwata ihe-nkwata na iluta ihe-nluta n'agha; ichighari aka-gi imegide nkpọnkpọ ebe nke madu bi nime ha ub͕u a, na imegide otù ndi nke achikọputaworo na mba di iche iche, nke lutaworo anu-ulo na ihe-ahia n'ọlu, ndi bi n'elu-ala nke uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m akwata ihe nkwata, lụtakwa ihe nlụta nʼagha. Aga m eweli aka m megide obodo ndị a niile e wugharịrị ewugharị, megidekwa ndị a niile e si na mba dị iche iche chịkọtaa, bụ ndị bara ọgaranya nʼanụ ụlọ na ngwongwo dị iche iche, ndị bikwa nʼetiti ala a.”