Ezekiel 39:10 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ha ewe ghara ikpata nkú n'ọhia, ha agaghi-eb͕utu kwa nkú n'oké ọhia; n'ihi na ha gāchiri ihe-agha funwue ọku: ha gākwata kwa ndi-nkwata-ha, luta kwa ndi-nluta-ha n'agha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha agaghị akpatakwa nkụ site nʼọhịa ọzọ, maọbụ gbuta ha site nʼoke ọhịa, nʼihi na ha ga-eji ngwa agha ndị a mere ihe ịfụnwu ọkụ. Mgbe ahụ, ha ga-akwata ihe onwunwe nke ndị ahụ kwakọrọ ihe onwunwe ha nʼagha, lụtakwa ihe onwunwe nke ndị ahụ lụnara ha ihe onwunwe ha nʼike. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.