Ezekiel 39:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si nnunu nile di iche iche, si kwa anu ọhia nile ọ bula, Chikọtanu onwe-unu, bia; zukọputanu n'akuku nile di buruburu, n'ihi àjàm nke Mu onwem nāchuru unu, bú àjà di uku M'nāchu n'elu ugwu nile nke Israel, ka unu we rie anu, ṅu kwa ọbara.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nwa nke mmadụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, kpọọ ụmụ nnụnụ niile oku, na anụ ọhịa niile dị iche iche, sị ha, ‘Chịkọtaanụ onwe unu, site nʼakụkụ niile bịanụ nʼọchụchụ aja m, nke mụ onwe m na-achụ nʼihi unu, bụ aja dị ukwuu nke m na-achụ nʼelu ugwu niile dị nʼIzrel. Nʼebe ahụ ka unu ga-anọ taa anụ, ṅụọkwa ọbara.