Ezekiel 39:23 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Mba nile gāma kwa na ọ bu n'ihi ajọ omume-ha ka emere ka ulo Israel je biri n'ala ọzọ; n'ihi na ha mekpuru emekpu megidem, M'we zonari ha irum: M'we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we site na mma-agha, ha nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha.