Ezekiel 40:22 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Window-ya nile na ulo-nbata-ya nile na nkwu-ya nile di kwa ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu; ọ bu kwa ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa ka ha ji arigo nime ya; ulo-nbata-ya nile di kwa n'iru ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Oghereikuku ya, mpụta ọnụ ụzọ ya na osisi nkwụ e sere nʼahụ aja ụlọ ahụ niile, dịka e mere nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, bụ otu ọtụtụ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asaa dị nke e si aga na mpụta ọnụ ụlọ ahụ na ncherita ihu ogige ezi.