Ezekiel 40:23 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Otù ọnu-uzọ-ama di-kwa-ra ogige di nime na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama ọzọ, n'akuku Ugwu na n'akuku Iru-anyanwu; o we tùa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ, ọgu cubit ise.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ọnụ ụzọ dị nke gara nʼogige dị nʼime, nke chere ihu ọnụ ụzọ mbata dị nʼugwu, dịka ọ dịkwa nʼakụkụ nke ọwụwa anyanwụ. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ.