Ezekiel 40:31 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ulo-nbata-ya nile chere iru n'ogige di n'èzí; nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua: nzọ-ukwu asatọ iji arigo ka ihe-nrigo-ya nwere.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi, oyiyi osisi nkwụ ka eji chọọ ogidi ọnụ ụlọ ahụ mma, ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.