Ezekiel 41:25 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ihe emere n'elu ha, bú n'elu ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Chineke, bu kwa cherubim na nkwu, dika nke emere n'elu mb͕idi-ya nile; nbata-uzọ nke osisi di kwa n'iru uzọ-nbata-ya n'èzí.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A tụnyere onyinyo cherubim na osisi nkwụ nʼelu ibo na-edubanye nʼụlọ ezumezu ahụ, dịka ndị ahụ a tụrụ nʼahụ mgbidi niile. E jikwa osisi rụchie elu ihu mpụta nke ọnụ ụlọ ahụ.