Ezekiel 41:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ulo ntà nke akuku di kwa otù ulo ntà nke akuku n'elu ulo ntà nke akuku ọzọ okpukpu atọ, ha di kwa orú na iri n'usoro; ha we ba nime mb͕idi ahu nke diri ulo ahu bayere ulo ntà nke akuku di ya buruburu n'akuku nile, ka ha we jide mb͕idi ahu, ghara ijide mb͕idi ulo onwe-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọnụụlọ nta ndị a dị nʼokpukpu atọ, nke ọbụla nʼelu ibe ya, okpukpu ọbụla nwere iri ọnụụlọ atọ. E nwere mgbidi gbara aja ụlọnsọ ahụ gburugburu nʼakụkụ niile, ka ha bụrụ ihe nkwado nye ọnụụlọ nta ndị a, ka ihe nkwado ndị a ghara ịbụ ihe a rụnyere nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.