Ezekiel 41:7 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ulo ntà nke akuku ndia di obosara kari ka ha nāla elu elu n'idi ulo ahu buruburu; n'ihi na idi ulo ahu buruburu nāla elu elu buruburu ulo ahu n'akuku nile: n'ihi nka obosara nke diri ulo ahu di uku kari n'elu; otú a anēsi n'ulo ntà di ala rigorue ulo ntà kachasi elu site n'ulo ntà di n'etiti.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E wuru ọnụụlọ nta ndị a ka obosara ọnụụlọ ndị ahụ niile dị nʼelu ibe ha dị ukwuu karịa obosara ndị nke dị nʼokpuru ha. Nʼụzọ dị otu a, obosara ọnụụlọ niile dị nʼokpukpu nke abụọ dị ukwuu karịa nke dị nʼala; nke atọ dịkwa ukwuu karịa nke abụọ. E wukwara ebe e si arịgo site nʼokpukpu nke dịkarịsịrị ala rigoruo nʼọnụụlọ ndị kachasị elu, site nʼokpukpu nke dị nʼetiti.