Ezekiel 43:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ buru kwa na ihere ihe nile ha meworo eme ha, gi me ka ha mara òmùmò ulo a, na ọtùtù-ya, na ọpùpù-ya nile, na nbata-ya nile, na òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, na òmùmò-ya nile, na iwu-ya nile, de kwa ha n'akwukwọ n'anya-ha: ka ha we debe òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, me ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ nʼezie na ihere emee ha nʼihi ihe ha mere, mgbe ahụ, kọwaara ha ihe niile metụtara otu a ga-esi wuo ụlọnsọ a, na ihe gbasara nkwado ya, na ihe gbasara ọnụ ụzọ ọpụpụ na mbata ya niile, ihe metụtara ebumnobi nke owuwu ya niile na usoro na iwu niile banyere ya. Depụta ihe ndị a nʼihu ha, nye ha ka ha lezie anya mezuo ihe niile metụtara usoro a ga-agbaso wuo ya.