Ezekiel 43:27 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Mb͕e ha debezusiri ubọchi asa ahu, ọ gēru kwa, n'ubọchi nke-asatọ, we ga n'iru, na ndi-nchu-àjà ganēme àjà-nsure-ọku nile unu na àjà-udo nile unu n'elu ebe-ichu-àjà; ihe-unu gātọkwam utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụbọchị nke asatọ, na nʼụbọchị ọbụla so ya, ndị nchụaja ga-achụ aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja, chụọkwa aja udo. Mgbe ahụ, aga m anabatakwa unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”