Ezekiel 44:30 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọzọ, ihe mbu nke nkpuru mbu nile nke ihe ọ bula, àjà-nbuli ọ bula nke ihe ọ bula, site n'àjà-nbuli nile unu, ndi-nchu-àjà gēnwe ya: ọ bu kwa utu ọka mbu unu ka unu gēnye onye-nchu-àjà, ime ka ngọzi dakwasi n'ulo-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mkpụrụ mbụ kachasị mma site na mkpụrụ ubi ọbụla na onyinye niile pụrụ iche ga-abụ nke ndị nchụaja. Ọka mbụ a kwọrọ akwọ, nke a na-eweta nʼihe ubi ga-abụkwa nke ndị nchụaja, ime ka ngọzị dịkwasị nʼụlọ unu.