Ezekiel 45:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma mb͕e unu gēme ka ala-unu dayere onwe-unu n'ihe-nketa, unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli, bú otù òkè di nsọ nke ala ahu: ogologo-ya gādi orú nnù amì uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, obosara-ya gādi kwa orú nnù na nnù ise: ihe nsọ ka ọ gābu n'ókè-ala-ya nile buruburu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Mgbe unu ga-eke ala ahụ dịka ihe nketa, unu ga-ebu ụzọ nye Onyenwe anyị otu oke nʼime ya ka ọ bụrụ oke dị nsọ nke ala ahụ. Ogologo ya ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita iri na otu. Ihe dị nsọ ka ala ahụ niile ga-abụ gbaa gburugburu.