Ezekiel 45:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
na otù nwa-aturu nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, bú nke sitere n'ọgu umu-aturu iri, site n'ebe-ita-nri nke Israel nke miri nēde nke-ọma; ibu onyinye-inata-iru-ọma, na ibu àjà-nsure-ọku, na ibu àjà-udo, ikpuchiri ha nmehie; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọzọkwa, otu atụrụ nke sitere nʼigwe atụrụ dị narị atụrụ abụọ, nke si nʼebe ịta nri nke Izrel a gbara mmiri nke ọma ka unu ga-eweta. A ga-eji ndị a chụọ aja mkpụrụ ọka, na aja nsure ọkụ, na aja udo, maka ikpuchiri ndị wetara ha mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.