Ezekiel 45:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, ka unu gēnwe ememe ngabiga, bú ememe nke ubọchi asa; achicha ekoghi-eko ka agēri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka unu ga-edebe Mmemme Ngabiga. Ọ ga-abụ mmemme abalị asaa. Nʼụbọchị ndị a, naanị achịcha nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ka unu ga-eri.