Ezekiel 47:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m'gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru ikperè-ukwu. O we tùa nnù cubit abua na ọgu íri, me ka m'gabiga, ọ bu miri nke ruru úkwù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O jikwa ihe ọtụtụ ya tụpụtakwa ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, durukwa m na-aga. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela m nʼikpere. Mgbe ọ tụpụtara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, o duuru m gafee mmiri ruru m nʼukwu.