Ezekiel 48:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ gādiri ndi-nchu-àjà ndi edoworo nsọ site n'umu Zedok, ndi debeworo ihe-ndebem; ndi nākpafughi mb͕e umu Israel kpafuru akpafu, dika ndi Livai kpafuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ ga-adịrị ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk ndị e doro nsọ, ndị sitere nʼikwesị ntụkwasị obi jeere m ozi, ndị na-esiteghị nʼiso ụzọ m kpafuo dịka ndị Izrel na agbụrụ Livayị mere mgbe ha mehiere.