Ezekiel 8:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma ọgu ndikom atọ na iri nime ndi-okenye nke ulo Israel nēguzo n'iru ha, Jeazanaia nwa Shefan nēguzo kwa n'etiti ha, onye ọ bula o jide ihe-ya iji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'aka-ya; ísì utọ nke igwe-oji nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure we rigo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihu ihe ndị a, ka iri ndị okenye asaa nke ụlọ Izrel, ha na Jaazanaya nwa Shefan guzo nʼebe ahụ. Onye ọbụla nʼime ha ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼaka ya, anwụrụ ọkụ si nʼihe nsure ọkụ ndị a na-agbagokwa elu.