Ezra 1:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Sairọs, bú eze Peasia, we chiputa ha site n'aka Mitredat, bú odozi-àkù, gua ha nye Sheshbaza, bú onye-isi Juda.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Sairọs bụ eze Peshịa, chịpụtara ha site nʼaka Mitredat, onye bụ odozi akụ, onye gụrụ ha ọnụ nye Sheshbaza, onye bụ onyeisi ndị Juu ahụ na-alaghachi Jerusalem na Juda.