Ezra 10:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ezra we si n'iru ulo Chineke bilie, jerue ime-ulo Jehohanan nwa Elaiashib: o we je n'ebe ahu, ma o righi nri, ọ ṅughi kwa miri: n'ihi na o nēru újú n'ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta.