Ezra 3:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Jeshua we guzo, ya na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, na Kadmiel na umu-ya ndikom, bú umu Juda, dika otù onye, ibu ndi-isi nke ndi nēje ozi ahu n'ulo Chineke: umu-ndikom Henadad na umu-ha ndikom ṅa umu-nne-ha, bú ndi Livai.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jeshua na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụnne ya, Kadmiel na ụmụ ya, ndị si nʼikwu Hodavaya, ha na ụmụ Henadad na ụmụ ha, na ụmụnna ha, ha niile bụ ndị Livayị, jikọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ.