Ezra 4:2 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ha we biarue Zerubabel nso, biaru kwa ndi-isi ulo nke ndi bu nna nso, si ha, Ka ayi so unu wue ulo: n'ihi na ayi nāchọ Chineke-unu, dika unu si achọ; ma ayi onwe-ayi adighi-achu àjà site n'ubọchi Isa-hadon, bú eze Asiria, onye mere ka ayi rigorue ebe a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ha bịakwutere Zerubabel na ndịisi ezinaụlọ sị ha, “Kwerenụ ka anyị nyere unu aka nʼọrụ iwu ụlọ a, nʼihi na anyị hụrụ Chineke unu nʼanya dịka unu onwe unu si hụ ya nʼanya. Lee na kemgbe Isahadon eze Asịrịa butere anyị nʼebe a, anyị alabeghị azụ ịchụrụ ya aja.”