Ezra 4:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Zerubabel na Jeshua na ndi fọduru nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel we si ha, Ọ dighi nke ayi na unu nwekọrọ n'iwuru Chineke-ayi ulo; kama ayi onwe-ayi gēwukwara Jehova, bú Chineke Israel, ulo, dika eze, bú Sairọs eze Peasia, nyere ayi iwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Zerubabel, na Jeshua na ndịisi ọzọ zara sị ha, “Unu enweghị oke ọbụla nʼọrụ iwuru Chineke anyị ụlọnsọ. Naanị ndị anyị ga-ewuru Onyenwe anyị, Chineke Izrel ụlọ ukwu a dịka Sairọs eze Peshịa nyere nʼiwu.”