Ezra 5:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ub͕u a, ọ buru na ọ di eze nma, ka achọ n'ulo àkù eze, nke di n'ebe ahu nime Babilon, ma ọ bu ezie na esitere n'aka Sairọs, bú eze, nye iwu iwu ulo a nke Chineke nime Jerusalem, ka eze zite-kwa-ra ayi ihe nātọ ya utọ bayere okwu a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma nʼobi, ya nye iwu ka e nyochaa nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị eze Babilọn, ịchọpụta maọbụ eziokwu na eze Sairọs nyere iwu dị otu a iwugharị ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem. Ka eze gwakwa anyị ihe bụ mkpebi ya banyere okwu a.