Ezra 6:5 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ọzọ kwa, ka enyeghachi ihe ọla-edo na ọla-ọcha nke ulo Chineke, bú nke Nebukadneza chiputara n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, chita na Babilon, ka achighachi kwa ha n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, ihe ọ bula n'ọnọdu-ya, gi dọba kwa ha n'ulo Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọzọkwa, a ga-ebughachikwa ngwongwo ọlaedo na ọlaọcha niile nke ụlọ Chineke, ndị Nebukadneza sitere nʼụlọnsọ ahụ dị nʼJerusalem buru gaa Babilọn, doghachikwa ha nʼụlọ Chineke.