Ezra 7:24 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ayi nēme kwa ka unu mara, na ọ dighi onye ka enyere ike n'aru ndi-nchu-àjà na ndi Livai ọ bula, ma-ọbu ndi nābù abù ọma, ma-ọbu ndi-ọnu-uzọ-ama, ma-ọbu Netinim, ma-ọbu ndi nēfè òfùfè nke ulo a nke Chineke, inara ha utu-ala, ma-ọbu utu-ahia, ma-ọbu utu-uzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m enyekwa iwu na ndị nchụaja niile, ndị Livayị niile, ndị ọbụ abụ niile, ndị nche niile, ndị ozi ụlọnsọ niile, na ndị ọzọ niile na-arụrụ Chineke ọrụ, agaghị atụ ụtụ ọbụla.