Ezra 8:31 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ayi we si n'osimiri Ahava n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa mbu bulie ije, ijeru Jerusalem: aka Chineke-ayi we di n'aru ayi, O we naputa ayi n'aka onye-iro ọ bula na onye nēche anwu n'uzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị hapụrụ osimiri Ahava nʼụbọchị nke iri na abụọ nke ọnwa mbụ, chee ihu anyị ịga Jerusalem. Chineke nọnyekwaara anyị, dọpụta anyị site nʼaka ndị iro ọbụla, na nʼaka ndị ohi.