Ezra 9:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma mb͕e emere ka ihe ndia gwusia, ndi-isi biarurum nso, si, Ndi Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, ha ekewapughi onwe-ha n'etiti ndi di iche iche nke ala ọzọ, nēme dika ihe-árú-ha si di, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus, na ndi Amon, na ndi Moab, na ndi Ijipt, na ndi-Amorait.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe e mesịrị ihe ndị a, ndịisi bịakwutere m sị, “Ndị Izrel na ndị nchụaja, na ndị Livayị, ekewapụghị onwe ha site nʼetiti ndị agbataobi ha, na omume arụ ha niile, dịka nke ndị Kenan, na ndị Het; na ndị Periz, na ndị Jebus, na ndị Amọn, na ndị Moab, na ndị Ijipt, na ndị Amọrait.