Ezra 9:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
nke I nyere n'iwu site n'aka ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, si, Ala ahu nke unu onwe-unu nābata inweta ya, ala isọ-nsọ ka ọ bu n'isọ-nsọ nke ndi di iche iche nke ala ọzọ, site n'ihe-árú nile ha, nke juputaworo ya site n'otu ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ, n'ọrurú-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
nke i ji dọọ anyị aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma, bụ ndị ohu gị. Nʼihi na i si nʼọnụ ha kwuo sị, ‘Ala ahụ unu na-abanye inweta bụ ala nke ndị bi nʼime ya mere ka ọ rụọ arụ. Nʼihi na ndị bi nʼime ya esitela nʼomume ọjọọ ha mee ka akụkụ ala ahụ niile rụọ arụ.