Ezra 9:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ewe chikọta n'ebe m'nọ onye ọ bula nke nāma jijiji n'okwu Chineke Israel, n'ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ; ma mu onwem nānọdu, ibobo we nwuam n'aru, rue mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ndị niile mara jijiji nʼokwu Chineke nke Izrel, gbakọtara m gburugburu nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọtaranụ. Mụ onwe m nọkwa nʼọnọdụ mgbagwoju anya ruo oge ịchụ aja nsure ọkụ nke anyasị.