Galatians 1:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka ikpe ọmụma Chineke dị nꞌisi onye ọ bụla, ma mụ onwe m kwa, nke ga-ekwusara unu ozi ọma ọzọ dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị kwusaara unu. Ee, ka ikpe ọmụma dịkwa, ọ bụladị nꞌisi mmụọ ozi ọ bụla si nꞌeluigwe bịa kwusaara unu ozi ọma ọzọ dị iche. Ka m kwuokwa ya ọzọ, “Ikpe ọmụma Chineke ga-adakwasị onye ọ bụla kwusaara unu ozi ọma dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị buru ụzọ kwusaara unu.”
Igbo 2006
Ma asi kwa na ayi onwe-ayi, ma-ọbu mọ-ozi nke sitere n'elu-igwe, gēzì unu ozi ọma ọzọ tukwasi ozi ọma nke ayi zìri unu, ya buru anathema (onye mmegide).
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ.