Galatians 2:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na mgbe o buru ụzọ bịa Antiọk, Pita na ụmụnna anyị ndị a na-ebighị ugwu, na-erikọta nri. Ma mgbe ndị Juu, ndị Jemes zitere, bịaruru Antiọk, Pita ekwekwaghị iso ndị mba ọzọ ahụ rikọọ nri, nꞌihi na ọ na-atụ egwu ihe ndị Juu a bu iwu nꞌisi, ndị sị na ọ dị mkpa ibi mmadụ ugwu tupuu a zọpụta ya, ga-ekwu.
Igbo 2006
N'ihi na mb͕e madu ufọdu akēsighi n'ebe Jemes nọ bia, ya na ndi mba ọzọ nērikọ ihe: ma mb͕e ha biara, o wezugabara we kewapu onwe-ya, ebe ọ nātu egwu ndi obibì-úgwù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya.