Galatians 2:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe m hụrụ ihe ọjọọ a ha na-eme, hụ na ha adịghị agazi ije dị ka eziokwu nke ozi ọma ahụ si dị, agwara m Pita okwu nꞌihu ha nile, sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ onye Juu site nꞌọmụmụ a mụrụ gị, ma ị kwụsịla idebe iwu ndị Juu, gịnị mere i ji na-agbalị ugbu a ime ka ndị mba ọzọ a debe iwu ndị Juu ahụ ị jụrụ ajụ?”
Igbo 2006
Ma mb͕e m'huru na ha agazighi dika ezi-okwu nke ozi ọma si di, asirim Kifas n'iru ha nile, Ọ buru na gi onwe-gi adi ndu dika ndi mba ọzọ, ma ọ bughi dika ndi-Ju, ọ bu ezie na i bu onye-Ju, ì si aṅa erugide ndi mba ọzọ ka ha so uzọ ndi-Ju?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe m hụrụ na ha adịghị eme ihe dị ka eziokwu nke oziọma ahụ si dị, agwara m Sefas okwu nʼihu ha niile, sị, “Ọ bụrụ na gị nwa onye Juu na-ebi ndụ dịka onye mba ọzọ, na-abụghị dịka onye Juu, olee otu ị ga-esi manye ndị mba ọzọ ka ha na-ebi ndụ dịka ndị Juu?”