Galatians 2:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
ma anyị bụ ndị Juu maara na mmadụ ọ bụla na Chineke enweghị ike ịdị nꞌudo, site nꞌidebe iwu ndị Juu, kama, na udo na-adị nꞌetiti Chineke na mmadụ nanị site nꞌokwukwe anyị nwere na Jisọs ịsachapụ mmehie anyị. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst, ka e mee ka Chineke nabata anyị, site nꞌokwukwe anyị, ọ bụghị nꞌihi na anyị debere iwu ndị Juu. Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a ga-azọpụta nꞌihi na o debere iwu ndị Juu.
Igbo 2006
ma ebe ayi matara na agughi madu n'onye ezi omume site n'ọlu di iche iche nke iwu, ma ọ bu nání okwukwe ekwere na Jisus Kraist ka eji gu madu n'onye ezi omume, ọbuná ayi onwe-ayi kwere na Kraist Jisus, ka ewe gua ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe ayi kwere na Kraist, ọ bughi kwa site n'ọlu di iche iche nke iwu: n'ihi na site n'ọlu di iche iche nke iwu ọ dighi anu-aru ọ bula, bú madu, agāgu n'onye ezi omume.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ma anyị maara na a dịghị agụ mmadụ ọbụla dị ka onye ezi omume site nʼọrụ nke iwu kama ọ bụ naanị site nʼokwukwe na Jisọs Kraịst. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst ka a gụọ anyị na ndị ezi omume, site nʼokwukwe anyị kwere na Kraịst, ọ bụghị nʼihi na anyị rụrụ ọrụ nke iwu. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a ga-agụnye ka onye ezi omume nʼihi na ọ rụrụ ọrụ nke iwu.