Galatians 2:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Kraịst obi ka ọ zọpụta anyị, mesịa chọpụta na anyị jehiere ụzọ ịtụkwasị ya obi, nꞌihi na nzọpụta dị nanị mgbe e biri anyị ugwu, na mgbe anyị debere iwu ndị Juu, ọ̀ gaghị abụ ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị ekwuo na okwukwe anyị nwere na Kraịst abụrụla ihe wetaara anyị ịla nꞌiyi? Ma Chineke ekwela na mmadụ ga-eche ụdị echiche a banyere Onyenwe anyị.
Igbo 2006
Ma ọ buru na ahuru na ayi onwe-ayi bu kwa ndi-nmehie, mb͕e ayi nāchọ uzọ agēsi gu ayi na ndi ezi omume nime Kraist, ọ̀ bu na Kraist bu onye nēje ozi nmehie? Chineke ekwela.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba!