Galatians 2:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Kama aga m abụ onye na-emebi iwu ma ọ bụrụ na m ebido na-akwalị ozizi ochie ahụ m na-agbalị ịla nꞌiyi, bụ ozizi nke na-asị na nzọpụta na-adịrị nanị ndị debere iwu ndị Juu.
Igbo 2006
N'ihi na asi na ihe m'kwaturu, ihe ndia ka m'nēwuli elu ọzọ dika ulo, anameme ka madu mara na abum onye-njehie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kama, ọ bụrụ na m ewugharịa ihe ndị ahụ m buru ụzọ mebie, ana m egosi na m bụ onye na-emebi iwu.